Egbe ndị Arsenal o nwereike ịgbagbutere ha iko Champions League?
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Egbe ndị Arsenal, o nwereike ịgbagbutere ha iko Champions League n'afọ a?
Arsenal ebubeghị iko Champions league mbụ! Ọ gbara gị gharịị? Mana ọ bụ eziokwu. Kemgbe afọ otu narị na iri atọ na itoolu e jiri hiwe otu egwu bọọlụ Arsenal na mba Ịngland, aka ha emetụbeghị iko Champions League.
Asọmpi Champions League, nke otu Union of European Football Associations (UEFA) na-ahazi bụ nke e ji akpọkọta otu bọọlụ ndị kachasị akụ na mpaghara Europe n'ịmaaka e ji a mata onye bụ ọkaibe.
Kemgbe asọmpi Champions League malitere kemgbe afọ iri asaa na otu gara aga, ụfọdụ otu egwu bọọlụ dị na mba England amabutela iko ya ugboro ugboro.
Liverpool na-agba onye nke mbụ dịka ha buterela iko Champions league ugboro isii, ebe Manchester United na-agba onye nke abụọ, dịka ha buterela ya ugboro atọ. Chelsea na Nottingham Forest na-agba ndị nke atọ, maka na ha ebutela iko Champions League ugboro abụọ, ebe Aston Villa na Manchester City na-agba ndị nke anọ maka ibute iko ahụ naanị otu ugboro.
Mana ọ pụtaghị na Arsenal anaghị agba mbọ ooo, ha anwaala naanị otu ugboro irute n'ogogo nke ikpeazụ n'asọmpi afọ 2005 banyere 2006, mana otu egwu bọọlụ Barcelona mechara jiri ọkpụ goolu abụọ a satara otu napụ ha egbe ha, wee buru iko ahụ.
Ugbua, dịka ọ gachara afọ iri abụọ, ya bụ n'ụbọchị 30 Mee 2026 ka a ga-apịachi asọmpi Champions League nke afọ 2025 banyere 2026, ebe Arsenal ga-anọ zute otu egwu bọọlụ Paris Saint-Germain, bụ ndị ji iko Champions League ka ọ dị ugbua. Ajụjụ wee bụrụ, Arsenal ọ ga-eru n'isi mmiri a, ka osimiri PSG ọ ga-eri Arsenal ma riekwa egbe ha?



