Ihe mere m jiri mepee ụlọ cinema maka ihe nkiri Africa na mba UK – Mo Abudu

Aha onyonyo, Ihe mere m jiri mepee ụlọ cinema maka ihe nkiri na mba UK – Mo Abudu
Ihe mere m jiri mepee ụlọ cinema maka ihe nkiri Africa na mba UK – Mo Abudu
Mgbe e biputara ya

Nwa afọ Nigeria na-eme ma na-ahazi ejije bụ Mo Abudu, agwala BBC ihe mere o jiri mepee ụlọ cinema na London ebe a ga na-egosi ihe nkiri Africa.

O kwuru na ọ bụ maka na ọtụtụ ndị si ebe dị iche iche amaghị Africa tinyere na ndị mmadụ si mba ndị ọzọ nwere ajọ echichi banyere Africa.

⁣Mo Abudu kwuru na o mepere ụlọ cinema ahụ iji nye ndị Africa na-eme ihe nkiri ohere igosi ụwa niile ihe ha na-eme iji hụ na a gbanwere etu ndị mba ọzọ si ahụta Africa.