Nigeria vs South Korea: Falcons achakeela ka ugo

Ebe foto si, AFP
Mgbe e biputara ya
Ọgbọ egwuregwu Fransị enwurula ọkụ ugbua dịka Falcons nke Naịjirịa tuuru ugo.
Goolu mbụ Naịjirịa si n'aka ndị Sawụt Korea mgbe Kim Do-yeon gbabara bọọlụ na neetị ha na nkeji 29.
Nke a mere na amalitere nyocha site na Teknụzụ VAR tupu anabata goolu ahụ.
Asisat Oshoala gosiri ndị Sawụt Koria na Naịjirịa abịaghị egwuregwu ụmụaka na nkeji 75.
O ji otu ọkpụ goolu saa ha anya nke mere na Naịjirịa meriri asọmpị ahụ.
N'ikpeazụ, Naịjirịa ji mmeri a gbara isi onwe dịka Norway merichara ha n'asọmpị nke mbụ ha.


























