Kwankwaso, Sowere akatọọla mgbochi e gbochiri Peter Obi ịbata na Benue steeti

Peter Obi ji akwụkwọ nhọpụta ya iji zọọ ọkwa onyeisiala na pati NDC, yi uwe ojii ma kpuru okpu ojii nwere akara pati NDC ma yirikwa ugegbe anya.

Ebe foto si, Peter Obi/X

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na Naịjirịa akatọọla mgbochi e gbochiri ụgbọala bu onye ọkọlọtọ pati Nigeria Democratic Congress (NDC) azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka na-abịa n'afọ 2027 bụ Peter Obi ịbanye Makurdi, isi obodo Benue steeti.

Rabiu Kwankwaso, na-azọ ọkwa osote onyeisiala na pati NDC katọrọ omume ahụ ma kọwaa ya dịka "ụbọchị ọchịchịrị nye ọchịchị onye kwuo uche ya" na Naịjirịa.

N'ozi o wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị Tuzde 8 Septemba 2026, ka Kwankwaso kpọrọ gọọmenti Benue steeti oku ka ha chọpụta ma nye ndị kpatara agwa ahụ ntarama ahụhụ kwesịrị ekwesi, na-ekwu na iwu Naịjirịa nyere ụmụafọ ikike ịgagharị ebe ọbụla ha chọrọ.

Kwankwaso, bụbu gọvanọ Kano steeti kpọkwara Onyeisiala Naịjirịa oku ka ọ dọọ ndị gọvanọ, ọkachasị ndị so na pati All Progress Congress (APC) nọ n'ọchịchị ugbua, aka na ntị megide omume ọbụla nwereike imebi ọchịchị onye kwuo uche ya Naịjirịa.

O kpọkwara ndị mba ụwa, ndị nnọchi anya mba ọzọ na ndị na-ahụ maka ntuliaka ka ha lebara ihe a mere anya.

N'okwu ya, "Ana m akpọkwa ndị mba ụwa, gụnyere ndị nnọchi anya mba ofesi na ndị otu ndị na-ahụ maka ntuliaka, ka ha lebara ihe merenụ anya."

Ọ gara n'ihu gwa ndị ọchịchị Naịjirịa ka ha kwado iwu, ma gbaa mbọ chekwaa ndị isi otu ndị na-agba gọọmenti nọ n'ọchịchị ụkwụ, iji chekwaa nnwere onwe ọchịchị onye kwuo uche ya.

N'okwu nke ya, onye ji ọkọlọtọ African Action Congress (AAC) bụ Omoyele Sowore kwuru na ihe onyonyo ọ hụrụ gosiri ihe dịka atụmatụ e mere iji gbochie Peter Obi ịbanye Makurdi.

N'ozi o tinyere n'akara X ya, Sowore kwuru na ekwesịghị iji ime ihe ike, egwu maọbụ ndị ntoroọbịa gbochie onye ọbụla na-azọ ọkwa ọchịchị ịga ebe ọbụla maka ịchọ nkwado.

Sowore gwara ndị mere ihe ahụ ka ha kwụsị ụdị akparamaagwa ahụ, ma kwuo na ụdị omume ahụ nwereike ịkpata nnukwu nsogbu na Naịjirịa.

Gịnị mere mgbe Peter Obi rutere Benue steeti?

Peter Obi yi ugegbe anya ojii na uwe ojii na-ele anya n'elu.

Ebe foto si, Peter Obi/X

Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị "agboro" nọchiri okporoụzọ Gboko Road dị na Makurdi, isi obodo Benue steeti, wee gbochie ụgbọala ndị so Peter Obi ịgafe dịka ọ na-aga njem nleta na steeti ahụ n'ụbọchị Tuzde, abalị asatọ n'ọnwa Septemba 2026.

E kwuru na ndị ahụ nọ na-eti mkpu na ha achọghị ka Peter Obi banye n'obodo ahụ, wee gbochie ụzọ ahụ ruo ọtụtụ awa.

Nke a mere ka ọtụtụ ụgbọala na ndị njem ghara ịga ebe ha na-aga.

Na nkọwa ya, Peter Obi kwuru na ya gara Benue Steeti n'ụtụtụ Tuzde iji tie ndị ezinaụlọ a wakporo na Yelwata aka n'obi, dịka e kwuru na e gburu ihe karịrị mmadụ 270 na mwakpo ahụ.

Obi kwuru na ụfọdụ ndị ọ kọwara dịka ndị "agboro" gbochiri ụgbọala ya ịga n'ihu, na-eti mkpu sị ya ka ọ laghachi azụ.

Obi kwuru na njem ya na steeti ahụ abụghị maka mkpọsa ndọrọndọrọ ọchịchị, kama ọ bụ iji gosi ndị mmadụ ọdachi ahụ metụtara ịhụnanya na nkwado.

Gịnị ka gọọmenti Benue steeti kwuru?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Na nzaghachi, gọọmenti Benue steeti gọnarịla itinye aka n'ihe mere Peter Obi na ndị so ya.

Odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ steeti ahụ bụ Kula Tersoo, kwuru na gọọmenti amaghị na Peter Obi na-abịa.

Tersoo gbakwunyere na gọọmenti steeti ahụ anaghị eji ndị ntoroọbịa maọbụ ndi omekome eme ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ sịrị na Obi abụghịkwa onye gọvanọ Benue bụ Hyacinth Alia kwesịrị ịtụ egwu.

N'otu aka ahu, Kọmishọna mgbasa ozi na Benue Steeti bụ Solomon Iorpev, boro ebube na Peter Obi na-achọ ịkpata nsogbu n'etiti ya na gọọmenti steeti ahụ.

Iorpev kwuru na Obi emeela ihe dị otu a na mbụ site na agwaghị gọọmenti steeti tupu ọ malite njem nleta ya, n'agbanyeghị ọkwa ya dịka onye bụbu gọvanọ na onye na-azọ ọkwa onyeisiala.

O kwuru na steeti gaara ahazi nchekwa Peter Obi ma ọ bụrụ na o degara gọọmenti akwụkwọ tupu njem ya.

N'agbanyeghị na Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ kwuru na ya amaghị ndị gbochiri ụgbọala Obi, ọ gakwara n'ihu kwuo na ọbịbịa Obi dabanyere n'otu oge ụfọdụ ndị ntoroọbịa si ime obodo na-enwe nzukọ.

Kedụ ugboro ole njem nleta steeti Peter Obi nwere nsogbu?

Nchọcha BBC News Igbo mere gosiri na njem Peter Obi mere na Benue steeti abụghị nke mbụ njem ya kpalitere arụmụka maọbụ nsogbu.

N'afọ 2025, gọọmenti Benue dọrọ aka na ntị maka ọbịbịa ndị ọkwa ha dị elu na steeti ahụ n'enweghị nkwado gọọmenti.

N'agbanyeghị gọọmenti steeti ahụ akpọghị onye ọbụla aha n'ozi, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu kọwara na ọ bụ Peter Obi ka ozi ahụ metụtara dịka Obi wepụtara ozi na ya na-aga njem nleta na steeti ahụ iji nyere ndị nọ n'ogige ndị enweghị ụlọ bi aka.

Cheta na aka na-achị Edo steeti bụ Monday Okpebholo pụtara n'ọnwa Julaị 2025 were dọọ Peter Obi aka na ntị ka ọ ghara ịbịa na steeti ma ọ bụrụ na ọ gwaghị ya maọbụ nkwado nchekwa.

Mana gọọmentị Edo steeti mechara kọwaa na ha amachibidoghị Peter Obi ịbata steeti ha.

Chetakwa Peter Obi gbanahụrụ ọnwụ n'ụbọchị Tuzde abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026, na Edo steeti ebe ha na ndị otu ya gara ị nabata Olumide Akpata na pati African Democratic Congress nke bụ pati ọhụrụ Peter Obi sonyere n'oge ahụ.