Etu nwa afọ abụọ si nwụọ n'ụlọakwụkwọ dị na Riva Steeti

Foto Winnie Akekwe na nke ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School.

Ebe foto si, Screengrab/Winnie Akekwe family lawyer

Nkọwa foto, Foto Winnie Akekwe na nke ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Winnie Akekwe dị afọ abụọ nwụrụ n'ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School dị na Pọtakọt, Riva steeti.

Ọnwụ Winnie Akekwe bụ ihe a na-adọgharị ugbua maka esemokwu maọbụ nghọtafe dapụtara n'etiti ụlọakwụkwọ ahụ na ezinaụlọ nwatakịrị nwụrụ anwụ.

Mana etu nwatakịrị ahụ si nwụọ nakwa ihe gburu ya bụ ihe kacha ebute esemokwu ahụ.

Ọkaiwu ezinaụlọ Akekwe bụ Cheta Nwanze kpọrọ oku ka ndị uweojii mee ezigbo nnyocha banyere ọnwụ nwatakịrị ahụ, chọpụta etu o si nwụọ nakwa ihe niile mere.

Etu ọnọdụ si dị ugbua, BBC News Igbo chọpụtara na ezinaụlọ Winnie Akekwe nwụrụ anwụ nakwa ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School nwereike ịga ụlọikpe banyere nsogbu a n'oge adịghị anya.

Ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School dị na Pọtakọt Riva state

Ebe foto si, Sreengrab

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School dị na Pọtakọt Riva state

Ihe ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School kwuru maka ọnwụ Winnie Akekwe

N'ozi ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School kesara nke BBC News Igbo nwetara, ka ha kwuru na ha na-akwado nnyocha niile banyere ọnwụ nwatakịrị ahụ.

Ha kọwara ọnwụ nwataakwụkwọ ahụ dịka ihe mgbawaobi.

N'okwu ha "ọ bụ ihe mgbanwa obi banyere ọnwụ nwatakịrị a na ntumado n'ụlọakwụkwọ anyị".

"Anyị na-ezigara ezinaụlọ o metụtara ozi itiaka n'obi".

Ha gara n'ihu kwuo na enweghị mgbe ha ji ekpuchi usoro nnyocha a na-eme banyere ọnwụ nwatakịrị ahụ.

Akwụkwọ ụlọọrụ Wisdom Gate International School wepụtara.

Ebe foto si, Wisdom Gate International School.

Ebubo ọkaiwu ezinaụlọ Winnie Akekwe boro ụlọakwụkwọ ahụ

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Thierry Nwala bụ ọkaiwu na-anọchitaanya ezinaụlọ Akekwe boro ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School ebubo ikpuchi ihe mere.

Nwala kwuru nke a oge ọ zara ajụjụ BBC News Igbo jụrụ ya banyere ọnwụ Winnie Akekwe.

O ji ohere ahụ nye nkọwa n'ihe na-esere ụlọakwụkwọ ahụ na ezinaụlọ Akekwe ugbua.

N'okwu ya "ihe ụlọakwụkwọ ahụ kwuru maka ọnwụ Winnie Akekwe n'ụtụtụ abụghịzị ihe ha kwuru na mgbede; okwu ha gbawere".

Nwala gara n'ihu kwuo na "e dosara Winnie Akekwe n'okpuru ebe ihe ọba akwụkwọ "bookshelf" ka ọ rahụụra tupu ọba akwụkwọ ahụ daa ma dagbuo ya".

O boro ụlọakwụkwọ ahụ ebubo "ikpochapụ ihe akaebe niile kwesiri igosi ihe mere" ma kwuo na ihe ụlọakwụkwọ ahụ mere dịka "ikpuchi ihe mere".

Ọ gara n'ihu kwuo na "a tọhapụrụ ndị e jidere banyere ọnwụ nwatakiri ahụ n'otu ụbochị ahụ ndị uweojii na Rumuokoro jidere ha".

Ọ kwuru na "ụlọakwụkwọ ahụ na-eziga ndị mmadụ ka ha na ezinaụlọ nwa ha nwụrụ nwee nkwekọrịta ma kwuo na ezinaụlọ Akekwe achọghị ihe ọbụla dịka ihe itiaka n'obi n'ụdị ọbụla".

Ọ sị na naanị ihe ezinaụlọ Akekwe chọrọ bụ ka ha nwete ikpe nkwụmọtọ, nakwa ka ndị aka ha dị n'ọnwụ nwa ha zara ọnụ ha.

Winnie Akekwe na ihe a sị dagburu ya.

Ebe foto si, Akekwe family

Ọsịsa ụlọakwụkwọ Wisdom Gate nyere maka ebubo e boro ha

Mana ọkaiwu na-anọchịtaanya ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School, bụ Frimabo Gabriel Warmate sị na ebubo a na-ebo ha ikpuchi ihe mere abụghị ezi okwu.

Warmate jị ohere ahụ zigara ezinaụlọ Akekwe ozi itiaka n'ọbị maka ọnwụ nwa ha ma kwuo na "ụlọakwụkwọ ha gara kpọtụrụ ndị uweojii mgbe ihe a mere ma na-enyereaka na nnyocha niile a na-eme banyere ya"

Mana mgbe onye ntaakụkọ BBC News Igbo juru ya ajụjụ banyere etu nwatakịrị ahụ si nwụọ nakwa ihe gburu ya, okweghị asa ajụjụ ahụ.

Ọ kwuru sị na "ndị ọ dị n'aka ime nnyocha maka ya na-eme ya".

O kwukwara sị "ọdịghị mma ikwu ihe nwereike imetụta nnyocha a na-eme maka ya".

Warmate sị na ụlọakwụkwọ ahụ eruola afọ iri abụọ ma kwuo na ha enwebeghị ụdịrị nsogbu ahụ n'oge garaaga.

Ọ gara n'ihu kwuo na tupu ihe a eme na ụlọakwụkwọ na ezinaụlọ Akekwe enweghị nsogbu n'oge garaaga.

Foto Winnie Akekwe

Ebe foto si, Winnie Akekwe family

Nkọwa foto, Winnie Akekwe

Gịnị ka ndị uweojii kwuru maka ihe mere?

N'ọnwa Maachị 2026 ka ndị uwojii kwuru na ha ebidola nnyocha banyere ọnwụ nwataakwụkwọ dị afọ abụọ nwụrụ n'ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School dị n'Eligbolo.

N'ozi ndị uweojii wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ha na Riva steeti n'oge ahụ bụ Grace Iringe-Koko binyereaka ka ha kwuru na nnyocha ahụ dịzị n'aka ndị "State Criminal Investigation and Intelligence Department (SCIID)".

Grace zakwara ajụjụ banyere ebubo ezinaụlọ nwatakịrị nwụrụ na-ebo ha banyere nnyocha "autopsy" nke ha kwuru na ha ahụghị akwụkwọ mpụtara ya.

Grace sị na enwebeghị mgbe ezinaụlọ nwatakịrị nara ha ndekọ maọbụ mpụtara akwụkwọ autopsy n'usoro ha kwesiri.

O nyere ezinaụlọ nwatakịrị ahụ ndụmọdụ ka ha tinye akwụkwọ n'usoro ha kwesiri iji nweta ndekọ na mpụtara nnyocha ihe kpatara ọnwụ 'autopsy' nwa ahụ.

Grace kwuru na "Ihe butere ọnwụ nwatakịrị ahụ ka bụ ihe na-edobeghị anya maka na nnyocha ka na-aga n'ihu.

Gọọmenti Riva steeti emechiela ụlọakwụkwọ ebe nwatakịrị a nwụrụ

Gọọmenti Riva steeti emechiela ụlọakwụkwọ Wisdom Gate International School dị n'Eligbolo maka ọnwụ nwatakịrị dị afọ abụọ nwụrụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị 2026.

Gọọmenti mere ka a mata nke a site n'akwkwọ ozi Peters Nwagor bụ kọmịshịọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ binyere aka.

Ha sị na nke a bụ maka ime nnyocha banyere ọnọdụ nchekwa na ihe ize ndụ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Akwụkwọ gọọmenti Riva steeti wepụtara.

Ebe foto si, Rivers state govt.

Ha sị na ha emeela nnyocha maka ịchọpụta ihe gburu nwatakịrị ahụ ma zutekwa ndị nwe ụlọakwụkwọ ahụ.

Ha ji ohere ahụ ziga ozi itiaka n'obi nye ezinaụlọ nwa ha nwụrụ ma rịọ ọhanaeze ka enye ha ohere ka ha ruo uju maka nwa ha nwụrụ anwụ.

"Dịka gọọmenti anyị enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ dị n'Eligbolo ruo mgbe a ga-emecha nnyocha banyere ihe mere".

O kwuru na ọ bụ ọrụ ha ime ka ụlọakwụkwọ tinyere izere ndụ na nchekwa ụmụakwụkwọ ha.