E boola ebubo na otu nwoke gburu nwunye ya, gbaa ọsọ n'Imo Steeti

Aha onyonyo, E boola ebubo na otu nwoke gburu nwunye ya, gbaa ọsọ n'Imo Steeti
E boola ebubo na otu nwoke gburu nwunye ya, gbaa ọsọ n'Imo Steeti
Mgbe e biputara ya

N'ụtụtụ Mọnde 13 Julaị 2026 ka ndị mmadụ tetara ụra hụụ ozu nwaanyị na mbaraezi otu ụlọụka dị n'Ọwaelu, n'okpuru ọchịchị ime obodo Owere Nọt n'Imo Steeti.

Ndị mmadụ boro ebubo na ọ bụ di nwaanyị ahụ gburu ya, kpọrọ ụmụ ya abụọ rie mbọmbọ ma gbahapụ obere nwa ya ka na-aṅụ ara, bụ onye a hụrụ ka ọ na-ebe akwa n'akụkụ ozu nne ya.

Ka e mesịrị, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye wepụtara ozi kwuo na ha anụla gbasara njinji ahụ. O kwuru na ndị ọrụ ha na mpaghara Owere Nọt agaruola ebe ahụ e mere arụ a, kpọpụta obere nwa ahụ ma kpọnye ya otu onye ezinaụlọ ya.

Okoye kwukwara na ndị uweojii esinyela imi n'ala ugbua iji chọpụta ihe mere ede jiri bee nwịị, ma hụkwa na ha nwuchiri ndị mere arụ ahụ ma napụtakwa ụmụaka abụọ ndị nke fọrọ afọ.

Oge onye ntaakụkọ BBC garuru n'Ọwaelu, ọ gbara mbọ inweta ozi rijuru afọ n'aka ndị obodo mana o nweghị onye kwere agwa ya okwu, tinyekwara ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ.

Ka e mesịrị otu nwoke sịrị na ya pụtara n'ụtụtụ, hụụ ebe ndị mmadụ gbakọrọ na-eti mkpu. Oge ọ jụrụ ihe na-eme, ha agwa ya na otu onye nche gburu nwunye ya ma kpọrọ ụmụ ya gbafuo.

O kwukwara na ndị uweojii agaala bupụ ozu nwaanyị ahụ.