Ụlọikpe amaala mmadụ anọ ikpe ọnwụ maka mwakpo e mere n'Ụka Katọlik n'Owo

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ụlọikpe amaala mmadụ anọ n'ime mmadụ ise ikpe ọnwụ maka ebubo ime mwakpo n'ụlọụka Katọlik dị n'Owo n'Ondo Steeti ma gbuo mmadụ iri anọ na otu.
E mere mwakpo ahụ n'ụlọụka St Francis Catholic Church Owo dị n'Ondo Steeti n'ụbọchị 5 Juun 2022.
Na nchabi ikpe ya, Ọkaikpe Emeka Nwite kwuru na mmadụ anọ ahụ a na-enyo enyo, ndị so n'otu ọjọọ a kpọrọ Iswab ka aka ha dị n'ogbugbu mmadụ ahụ, ebe onye nke ise esoghị ha.
Ọkaikpe ahụ nabatara ebubo itoolu niile e boro mmadụ anọ, ma kachapụ ebubo onye nke ise.
Ụlọikpe kwuru ka a kwụgbuo mmadụ anọ ahụ.



























