Ọ bụ ndịagha chọrọ ịkwatu ọchịchị n'ike wakporo Niamey - Gọọmenti Niger

Onye agba mba Niger bu egbe ma nọrọ n'ụgbọala ndịagha

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ mgbasaozi TV mba Niger ekwuola na ọ bụ ndị ojiegbe chọrọ ịkwatu ọchịchị n'ike wakporo na Niamey bụ isiobodo mba ahụ n'ụtụtụ Satọde 29 Ọgọst, 2026.

Akụkọ kwuru na mwakpo ahụ bụ n'ogige ndịagha Base 101 ka ndị ahụ wakporo.

E kwuru na ndị ojiegbe ahụ gbara mbọ ịnwụchi ndịagha nọ n'ogige ahụ ma gbaa egbe n'ebe dị iche iche na Niamey.

Ka ọ dị ugbua, ndị ọchịchị akpọọla oku ka ndị obodo dere juu ma ghara ịtụ egwu ọbụla.

Cheta na ndịagha ji ọchịchị na Niger kemgbe afọ 2023 dịka ha kwaturu ọchịchị Onyeisiala Moahmed Bazoun n'ike.

Niger, Mali na Bokịna Faso bụ mba atọ so n'otu Alliance of Sahel States (AES). Ọ bụ ndịagha ji ọkwa ọchịchị na mba atọ a.

Ihe anyị ma maka ụda egbe a nụrụ n'isiobodo mba Niger

Ụgbọala nọ n'ogige ọdọụgbọelu dị na mba Niger

Ebe foto si, ISSOUF SANOGO/AFP via Getty Images

A nụrụ ọtụtụ ụda egbe n'ebe dị iche iche na Niamey bụ isi obodo mba Niger n'ụtụtụ Satọde 29 Ọgọst 2026. Ndị hụrụ oge ihe mere kwuru na a lụrụ nnukwu ọgụ n'ebe dị nso n'ọgọụgbọelu Diori Hamani International Airport, n'ogige ndịagha 101 nakwa n'obo ọchịchị onyeisiala.

Otu onye bi na Niamey gwara BBC na ha bidoro ịnụ ụda egbe oge ọ kụrụ elekere nke mbụ n'ụtụtụ Satọde.

O kwuru na ụda egbe na-ada n'ogige ndịagha dị na Niamey nke dị nso n'ọdọụgbọelu mba Niger.

Ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ndị obodo na-agba dịka ụda egbe ahụ na-ada agharaaghara na Niamey.

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara ndị ntaakụkọ na ndị mere mwakpo ahụ bụ ọdọụgbọelu ahụ ka ha bu n'obi nakwa obi ọchịchị onyeisiala.

Otu onye ụlọomeiwu AES kwuru na ndị ọrọ nchekwa enwerela ọnọdụ n'ogige ndịagha 'Air Base 101' ma kọwaa ndị mere mwakpo ahụ dịka ndị na-eyi ọha egwu.

Mana BBC amatabeghị nke bụ eziokwu.

Ndịagha Niger gwara ndị bi n'isiobodo Niamey ka ha dere juu dịka ha nụrụ ụda egbe ahụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọọrụ National Council for di Safeguarding of di Homeland (CNSP) kwuru na ha akpọkọọla ndị ọrụ nchekwa dị iche iche iji chekwaa obodo ahụ.

Ha gwara ndị obodo ka ha ghara ịtụ egwu ma kwụsị ikesa ozi ụgha banyere ihe ahụ mere.

Akụkọ kwuru na ọ bụ otu Islamic State of Sahel kpara agwa ahụ mana otu egwubeghị ihe ọbụla.

Ka ọ dị ugbua, enweghị onye ma ndị kpara agwa nakwa ihe bụ ebumnobi ha. O dobeghị anya ụfọdụ ihe mebiri site na mwakpo a.

N'aka nke ọzọ. o doghị anya ka mwakpo e mere ọ bụ atụmatụ ịnapụ ọchịchị n'ike.

A kpara nkata ịwakpo ọdọụgbọelu ahụ nakwa ogige ndịagha dị ya nso ugboro abụọ n'afọ a. Otu Islamic steeti wakporo ebe ahụ n'ọnwa Jenụwarị 2026 ebe otu al-Qaeda nke ha na otu JNIM na-enwe mmekọ kwuru na ọ bụ mere mwakpo mere n'ọnwa Juun.

Ndịagha gbochiri mwakpo abụọ ahụ.

Ọdọụgbọelu Diori Hamani Airport bụ otu ebe mba Niger nwere ụfọdụ akụrụngwa nchekwa ha nke e ji echekwa ọdọụgbọelu ndịagha nakwa nke ndị nkịtị.

Ọ bụ n'ọdọụgbọelu ka e nwere ọtụtụ akụrụngwa nke metụtara Alliance of Sahel State (AES) bụ otu na-ahụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa nchekwa na mba atọ gụnyere Niger, Mali na Bọkịna Faso.

Ndịagha ji ọkwa ọchịchị na mba atọ a dịka ha napụrụ ọchịchị n'ike n'ihi esemokwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ajọ ọchịchị nakwa oke mwakpo dị iche iche.

Gọọmenti Niger agbaala mbọ n'agha na na-ebu megide ndị otu na-eyi ọha egwu.

Ndịagha ji ọkwa ọchịchị na mba Niger dịka kemgbe ọnwa Julaị 2023.

Ndịagha nke Ọchịagha Abdourahamane Tiani nọ n'isi napụrụ ọchịchị na mba ahụ n'afọ 2023.