Osuofia, Mr. Ibu na Zebrudaya kpalitere mmụọ m n'ime ihe ịkpaọchị - Mazi Orinsi

Aha onyonyo, Ndị mmadụ dịka Osuofia, Mr. Ibu na Zebrudaya kpalitere mmụọ n'ihe ịkpaọchị - Mazi Orinsi
Osuofia, Mr. Ibu na Zebrudaya kpalitere mmụọ m n'ime ihe ịkpaọchị - Mazi Orinsi
Mgbe e biputara ya

Onye a ma ama na-eme ihe ịkpaọchị na soshal midia bụ Akams bu Afam e ji Mazi Orinsi maara akọwaala etu njem ya n'ịkpaọchị jiri malite.

Akams kwuru na ọ malitere na mgbe ọ dị obere nwee nnukwu mmasị n'ihe ịkpaọchị dịka ọ na-ekiri ndị dịka Osuofia, Mr. Ibu, Zebrudaya na ọtụtụ ndị ọzọ na-akpa ọchị n'ihe ejije.

"Mgbe m na-etolite ka m na-elele ndị ọzọ na-eme ụdịrị ihe a m na-eme na TV, mmadụ dịka Osuofia, Mr. Ibu, Zebrudaya na ndị ọzọ."

Ọ gara n'ihu kwuo na nna ya bụkwa onye nwere mmasị n'ihe ọkpaọchị ma bụrụkwa onye na-eme ihe ọchị so hiwe ntọala ya.

"Nna m bụkwa onye ụmụ ihe ndị a na-amasị, ọ naghị eji kaseti ihe onyonyo egwuri egwu."

O kwuru na mgbe ọ bụ nwata, na ụmụaka ndị ọzọ na-ekiri ihe ịkpaọchị ka ha kirie, kama na ọ na-ahụta onwe ya n'ime ihe ịkpaọchị ọbụla ọ na-ekiri.

Akams sị na ọ malitere ime ihe ịkpaọchị n'afọ 2019 kama na o nyere ya nsogbu ịgbapụta n'oge ahụ maka na ndị kwesịrị ị na-ekiri ya anaghị ahụ ya n'oge ahụ kama na nke ahụ egbochighi ya ị gaa n'ihu.

"Mgbe m bidoro mewe ihe nkiri egwuregwu bụ n’afọ 2019, mgbe ahụ onye mụ na ya na-eso na-anọ n’ime ọhịa na-agụ ntaakụkọ, akụkọ pụta, anyị ewere ya tụgharịa ya n’egwuregwu nakwa n’olu Igbo ma bipụta ya."

Ọ gakwara n'ihu kọwaa etu o si nwete aha ya ọ na-aza ugbua bụ 'Mazi Orinsi' nke ọ sị pụtara onye nwereike iri nsi mana o nweghi ihe ọbụla nwereike ime ya.

O kwuru na uwe o ji eme ihe nkiri ugbua bụ nke nna ya chịnyere ya nke o jiri duo ya ụlọ n'ihi na ọ hụrụ ihe ọ na-eme n'anya.

Kirie ihe o kwuru n'uju;