Women's World Cup 2019: Super Falcons ka Super Eagles agbata ihe na bọọlụ
Mgbe e biputara ya
Ndị ntaakụkọ n'egwurgwu bọọlụ bụkwa ụmụnwaanyị ekwuola na Super Falcons nke Naịjirịa ka agbata ihe na bọọlụ karịa ndị ogbo ha ndị nwoke.
Ha kwuru n'agbanyeghi nke a na ndị mmadụ karịsịa ụmụnwoke a naghị etinye uche na bọọlụ ụmụnwaanyị na Najirịa nakwa Afrịka.
Ha gara n'ihu kwuo na gọọmentị a naghị etinye uche nakwa ego n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka ha si eme na nke ụmụnwoke agbanyeghi na ụmụnwaanyị na-ebute Iko karịa ndị nwoke.
Na ọ bụ ihe ndị a mere anaghị anụ akụkọ banyere asọmpi dị iche iche ụmụnwaanyị na-agba na Naịjrịa.


